counter
Anaedo's Periscope

Guest Book

Sign Guest Book

Chatboard


My Flickr Fotos

www.flickr.com
This is a Flickr badge showing public photos from Obinna1. Make your own badge here.

Call Me

Call me!

Search My Blog

 

My Mailing List

Google Ads

Quick Poll

Which season of the year do you like best?
Spring
Summer
Fall
Winter

Digg's Latest

Random Musings on Disparate Subjects

"Every writer is a frustrated actor who recites his
lines in the hidden auditorium of his skull."---Rod Serling

(Best viewed in Mozilla Firefox or IE7)

Shidodo

posted Tuesday, 8 July 2008

Ndi Igbo mmamma nu o!

A choro m iwere ohere a were kelee nwa afo Igbo obula ebe obula ha no. Ihe m na-ayo bu ka Osebuluwa nile chekwaa ma dokwaa unu ebe obula unu no n'elu uwa a. Ya were aka ya di ike were dube unu ebe obula unu na-aru oru—ma ndi nkuzi, ma ndi na-azu ahia, ma ndi oru aka, ma ndi dokinta, na ndi okwo ugbo ala nile; ma nwoke ma nwanyi; ma okenye ma nwatakiri; ma onye ukwu maa onye nta.

I lee anya, I ga-ahu na oteela m dere ihe obula n'asusu anyi ebe a. Ya kpatara m ji si ka m were asusu anyi dee ihe onye obula nwere ike guo ma ghota. O buru na i di ka m, e nwere mgbe ogologo oyibo ndi obodo a na-agwu m ike kpamkpam!

Ubochi a ka m na-awaghari na Youtube dika nchi were hu ofu egwu Igbo togburu onwe ya. Egechara m egwu a ma bidokwa ya n'isi ozo gee ya ugboro ise. Amaghi m ihe kpatara na m noro n'akuku obodo oyibo a nu egwu ndi be anyi o di ka a ga-asi na o na-ato uto karia. Eleghi anya o buru maka na ike mkpomkpo egwu nwuru ndi obodo a na-ege ejula m afo. Mana etu osina di, o buru na egwu ndi be anyi na-amasi gi, gbaa mbo bido choghariwa egwu na Youtube. O ga-atu gi n'anya ihu na otutu egwu ndi be anyi anorolaari na neeti na-eche onye ga-abia lee ma gee ha!

Tupu m chefuo ajambene m na-ako ebe a, a ga m egosi unu egwu ndi Enugu steeti m nuru mere m ka wetuo ukwu ma gbapu ezigbo egwu. Ka m jugodu gi—Ugboro ole ka inugoro egwu mere gi itogbo tombo, togbo remote control, togbo ihe obula I na-eme ma hudata ala were zopu egwu? Ofu? Abuo? Ato? Anaghi m ekwu maka egwu ndi ahu I ga-anu na-ekwe naani n'isi n'isi. Egwu a bu egwu a ga-agba agba. Osogodu ya buru na ukwu gbajiri gi, I ga-ewere ofu ukwu nke ozo were na-azopu egwu amala!

 

Na-etufughi oge, biko umu oma m ji eme onu, naranu m egwu Shidodo.
 
 
 

 

 

 

 

tags:  

links: digg this    del.icio.us    technorati    reddit

AddThis Social Bookmark Button