Igbo ṅụọnụ! Yaa!
Igbo rienu! Yaa!
Igbo bienụ! Yaa!
Igbo kaanụ! Yaa!
Igbo kwenu! Yaa!
Igbo kwenuuu! Yaaaa!
Igbo Kwezuonuuuu! Yaaaaaaaaa!
Ụmụ Igbo, a wuchiela m ọzọ oo! Mma mma nụ oo!
A ma m na inụla egwu a mbụ, mana i hụla ya n'igwe onyonyo? Ọ bụrụ na ịhụbeghị ya mbụ, ngwa jikere ka i lee egwu Chief Stephen Osita Osadebe. Ọ kpọrọ ya "Nwanne m Ebezina". Eheeee....ụnu a na-akwadokwa i tunyere Pat Utomi n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị na-abịa? Kedụ ụdị nkwado ụmụ Igbo na-eme i ji were kwadobe onye e nwere ike ikọwa dịka onye aka ya ka ibe ya kwụrụ ọtọ? Onye ka ibe ya nwee ezigbo policy ga-ewepụta obodo anyi n'ogbaghara juru ebe nile?
O rubeghi mgbe anyi ga-ewelite olu were bara ndi agadi ekwe nka juru na Ohaneze mba maka na-enweghi ihe bara uru ha na-eme gbasara etu imi na ọnụ dị ndị Igbo n'ala ahụ a na-akpọ Nigeria? Kedụ ihe kpatara ndị a ji were kwụrụ Maazị Orjị Ụzọr kalụ n'azụ na-agbanyeghi na anyị ewerela anya anyị hụ na e nweghi ihe bara uru anyi ritara n'ọchịchị ọjọọ nwoke a zokwasara Abia steeti? Kedu mgbe ndị a kpọrọ onwe ha ndị ndu Ndigbo ji ghara i chọ ka anyị kwụsi ibe akwa nke Chief Osadebe ji ọmaricha egwu ya were kasie anyị obi?
E jikwa m ogu ooo!