Ụnụ anụkwala na ndị omekome na wuruwuru juru Anambra State Assembly na–ewezị iwe maka na Gọvanọ Peter Obi alọghachitela n'ọkwa ya. Biko gụọ ya ebe a. Biko, ọgịnị na-eme ndị ara a? A na-ekwu na ndị Anambra State ataala ahụhụ na ihe ihere n'ihi ihe Chris Uba na ndi otu ya mere Anambra State tupu Peter Obi abata, o ruo ka nwoke a batara, ndị omekome si PDP, a chụgharịwa nwoke a ruo mgbe ha mere ya impeach. E nweghị onye na-amaghị na impeachment ha bu nke adigboroja, mana ndị a kpọrọ ekwo nkụ ma mee ihe nile dị n'ike ha ka ha chụpụ nwoke na-enweghi ihe o mere. O ruzie ka a kagburu impeachment adigboroja ahụ, ofu onye n'ime ha mmụọ Chukwu metụrụ aka n'obi (Mike Balonwu) were bịa kpewe udo. Ọ dị mma. Anyị agbagharago ha maka ihe ọjọọ ha mere. Mana, gịnị kpatara ha ji emekwa mkpọtụ ugbu a? Ruo ole mgbe ka ndị a ga-ahapụ Peter Obi ka ọ rụọ ọrụ ya?
Bia ọbụrụ na e nwere onye ma onye ọbụla nọ na Anambra State Assembly, ya biko gaa dọọ ya aka na ntị ka ha kwụsị ime Anambra state ihe akaje. Oge eruola mgbe ndi afonto a juru na State Assembly ga-etinye aka ka e dozie obodo anyi. Lekwa, election ọzọ na-abịa n'ihe dị ka onwa abụọ, o rubeghi ka ndị State Assembly a ga-elo mpako, ekworo, anyaọkụ na obi ụfụ juru n'ime ha ka ha were jikọọ aka ọnụ ka e were dozie Anambra State? Ọ dịkwa egwu.
Ndi a ori bribe na ndi anya ukwu juru na State Assembly, chetakwa, ụbọchị ikpe na-abia oo.. Ngwa naranu m egwu Esther Ebigbo ọ kpọrọ "Judgment Day" :